2 Chronicles 21

1Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel. 3Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.

Jehoram eze Juda

4Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel. 5Jehoram gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem. 6O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. 7Ma nʼagbanyeghị nke a, Onyenwe anyị achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

8Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze. 9Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu. 10Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa.

Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.
11O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.

12Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị:

“Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,
13kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị. 14Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere. 15Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ”

16 Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha. 17Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.

18Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram. 19Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.

20Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.

Copyright information for IboBIU